2Joshụa nwa Nọn wee si na Shitim+ zipụ ụmụ nwoke abụọ na nzuzo. Ọ sịrị ha: “Gaanụ nyopụta otú ala ahụ dị, karịchaa Jeriko.” Ha wee gawa. Mgbe ha ruru Jeriko, ha bara n’ụlọ otu nwaanyị akwụna aha ya bụ Rehab+ wee nọrọ ebe ahụ.
31 Ọ bụ okwukwe mere ka Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna, ghara iso ndị nupụụrụ Chineke isi nwụọ, n’ihi na o ji obiọma nabata ndị bịara inyopụta otú obodo ahụ dị.+