-
Joshụa 9:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ndị eze niile bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan,+ na ndị nke bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu, na ndị nke bi na Shefila,* na ndị nke bi n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian*+ nakwa ndị nke obodo ha na Lebanọn cherịtara ihu, nụrụ ihe ahụ merenụ. Ndị eze ndị a bụ: eze ndị Het, eze ndị Amọraịt, eze ndị Kenan, eze ndị Perizaịt, eze ndị Haịvaịt, na eze ndị Jebus.+ 2 Mgbe ha nụrụ ya, ha gbakọrọ aka ka ha lụso Joshụa na ndị Izrel agha.+
-
-
Joshụa 9:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ha asị ya: “Ndị ohu gị si ebe dị ezigbo anya bịa+ n’ihi aha Jehova bụ́ Chineke gị, maka na anyị anụla akụkọ ya, nụkwa ihe niile o mere n’Ijipt.+ 10 Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọraịt, ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Eze abụọ ahụ bụ Saịhọn+ eze Heshbọn na Ọg+ eze Beshan, onye nọ n’Ashtarọt.
-