-
Diuterọnọmi 31:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Mosis wee kpọọ Joshụa ma gwa ya n’ihu ndị Izrel niile, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị a n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ọ ga-enye ha. Ọ bụkwa gị ga-enye ha ya ka ọ bụrụ ala ha ketara.+ 8 Ọ bụ Jehova na-ebutere gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị.+ Ọ gaghị ahapụ gị, ọ gaghịkwa agbakụta gị azụ. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.”+
-