27 Jekọb mechara lọta n’ebe Aịzik nna ya nọ na Mamri,+ na Kiriat-aba, ya bụ, Hebrọn, bụ́ ebe Ebreham bi mgbe ọ bụ onye mbịarambịa, bụrụkwa ebe Aịzik bụ onye mbịarambịa.+
13 Jehova gwara Joshụa ka o nye Keleb+ nwa Jefune ala ná mpaghara ebe o nyere ụmụ Juda. Ya enye ya Kiriat-aba (Aba a bụ nna Anak), ya bụ, Hebrọn.+14 N’ihi ya, Keleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ n’ebe ahụ.+ Ha bụ, Shishaị, Ahaịman, na Talmaị.+
7 N’ihi ya, ha họọrọ Kidesh+ nke dị na Galili n’ala Naftalaị bụ́ ugwu ugwu, họrọkwa Shikem+ nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hebrọn, nke dị n’ala Juda bụ́ ugwu ugwu.