Rut 4:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel na Lia, bụ́ ndị mụtara mba Izrel.+ Ka ihe gaziere gị n’Efrata,+ ka i nweekwa aha ọma* na Betlehem.+ Rut 4:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Ụmụ nwaanyị ndị agbata obi ya wee gụọ nwa ahụ aha. Ha sịrị: “A mụọlara Naomi nwa nwoke.” Ha gụrụ ya Obed.+ Ọ bụ ya mụrụ Jesi,+ nna Devid. Matiu 1:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Salmọn mụrụ Boaz, onye Rehab mụụrụ ya.+ Boaz mụrụ Obed, onye Rut mụụrụ ya.+ Obed mụrụ Jesi.+ Matiu 1:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Jekọb mụrụ Josef di Meri, onye mụrụ Jizọs,+ onye a na-akpọ Kraịst.+
11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel na Lia, bụ́ ndị mụtara mba Izrel.+ Ka ihe gaziere gị n’Efrata,+ ka i nweekwa aha ọma* na Betlehem.+
17 Ụmụ nwaanyị ndị agbata obi ya wee gụọ nwa ahụ aha. Ha sịrị: “A mụọlara Naomi nwa nwoke.” Ha gụrụ ya Obed.+ Ọ bụ ya mụrụ Jesi,+ nna Devid.