-
1 Samuel 9:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 “Ụdị oge a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin.+ Tee ya mmanụ ka ọ bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+ Ọ ga-anapụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia. N’ihi na ahụla m ahụ́ a na-emekpa ndị m. Anụkwala m ákwá ha na-ebe.”+ 17 Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Jehova sịrị ya: “Onye a bụ nwoke ahụ m gwara gị maka ya, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-achị ndị m.’”+
-