14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọta nwoke obi ya nabatara.+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị ya,+ n’ihi na i meghị ihe Jehova gwara gị.”+
13 Samuel wee were mpi mmanụ ahụ+ tee ya mmanụ n’ihu ụmụnne ya. Mmụọ Jehova malitekwara inye Devid ike pụrụ iche si n’ụbọchị ahụ gawa.+ Samuel mechakwara bilie lawa Rema.+