3 Gaa saa ahụ́, teekwa mmanụ ma yiri uwe gị* gbadaa n’ebe a na-azọcha ọka. Emela ka nwoke ahụ mata na ị nọ ebe ahụ ruo mgbe o richara nri, ṅụchaakwa mmanya.
2 N’ihi ya, Joab ziri ozi ka a gaa kpọọrọ ya otu nwaanyị onye Tekoa+ dị akọ. Mgbe ọ bịara, ya asị ya: “Biko, mewe ka onye na-eru uju, yirikwa ákwà iru uju, etekwala mmanụ.+ Mewe ka nwaanyị na-eru uju kemgbe.