-
2 Samuel 9:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Eze kpọziri Zaịba, bụ́ onye na-ejere Sọl ozi, sị ya: “Ihe niile Sọl na ezinụlọ ya niile nwe bụzi nke nwa nwa nna gị ukwu.+ 10 Gị na ụmụ gị na ndị na-ejere gị ozi ga na-akọ ubi ya, na-ewekwa ihe ubi ya mepụtara ka ọ bụrụ ihe mmadụ niile si n’ezinụlọ nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu, ga na-eri nri na tebụl mụ mgbe niile.”+
Zaịba mụrụ ụmụ nwoke iri na ise, nweekwa mmadụ iri abụọ na-ejere ya ozi.+
-