-
1 Ndị Eze 2:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 “Shimiaị nwa Gira, onye ebo Benjamin nke si Bahurim, bi gị nso. Ọ bụ ya kpọrọ m iyi ma kparịa m ezigbo mkparị+ n’ụbọchị m na-aga Mahaneyim.+ Ma mgbe ọ bịara zute m n’Osimiri Jọdan, m ji aha Jehova ṅụọrọ ya iyi na m gaghị egbu ya.+ 9 Ma ugbu a, ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ihe o mere,+ n’ihi na ị bụ nwoke ma ihe. Ị makwa ihe i kwesịrị ime ya. N’agbanyeghị na o meela agadi, ekwekwala ka ọ nwụọrọ onwe ya.”*+
-