-
2 Samuel 8:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 N’ihi ya, Toaị ziri Joram nwa ya ka ọ gakwuru Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Toaị agha). Joram wetakwaara Devid ihe ndị e ji ọlaọcha, ọlaedo, na ọla kọpa mee. 11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a, ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri.+ 12 Ndị ọ natara ihe ndị ahụ bụ ndị Siria, ndị Moab,+ ndị Amọn, ndị Filistia,+ ndị Amalek,+ nakwa Hadadiza+ nwa Rihọb eze Zoba.
-