-
2 Ihe E Mere 6:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 “Ọ bụrụ na eluigwe akpọchie, mmiri akwụsịkwa izo+ n’ihi na ndị Izrel nọ na-emehie gị,+ ha chee ihu ebe a kpee ekpere, too aha gị, hapụkwa mmehie ha maka na i menyela ha ihere,*+ 27 biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, ndị Izrel bụ́ ndị gị. Zi ha ụzọ dị mma ha kwesịrị iso,+ meekwa ka mmiri zoo+ n’ala gị nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ nke ha.
-