16 m ga-eme unu ihe ndị a: m ga-ata unu ahụhụ, mee ka unu rịa ụkwara nta na oké ahụ́ ọkụ, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịna-ahụ ụzọ nakwa ka ike gwụ unu.* Unu ga-agha mkpụrụ n’efu n’ihi na ọ bụ ndị iro unu ga-eri ya.+
25 Oké ụnwụ+ mechara daa na Sameria. Ndị Siria nọchibidokwara ya ruo mgbe otu isi jakị+ dara mkpụrụ ego ọlaọcha iri asatọ, otu ụzọ n’ụzọ anọ kab* nsị nduru adaakwa mkpụrụ ego ọlaọcha ise.