-
Diuterọnọmi 12:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Kama, gaanụ fee Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ bụla ọ họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya n’ebo unu niile nakwa n’ebe ọ họọrọ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ebi.+ 6 Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà unu a na-esu ọkụ,+ àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi,+ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ,+ na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye.+
-
-
1 Ndị Eze 8:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Jehova bụ́ Chineke m, biko, gee ntị n’ekpere ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara. Nụkwa ákwá ohu gị na-ebesara gị ka i nyere ya aka na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị taa. 29 Biko, ka anya gị dịrị n’ụlọ a ehihie na abalị, n’ebe a i kwuru gbasara ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’+ Geekwa ntị n’ekpere ohu gị chere ihu ebe a na-ekpe.+
-