-
2 Ihe E Mere 7:19-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ma ọ bụrụ na unu agbanwee, kwụsị iso ntụziaka m, kwụsị idebe iwu ndị m nyere unu, gaakwa fewe chi ọzọ dị iche iche ma kpọwara ha isiala,+ 20 m ga-efopụ unu n’ala m nke m nyere unu.+ M ga-ebibikwa ụlọ a m ji maka aha m doo nsọ. Ndị mba ọzọ niile ga-eji ụlọ a mere ihe ọchị.* Ha agaghịkwa eji ya kpọrọ ihe.+ 21 Ụlọ a ga-abụzi ụlọ e bibiri ebibi. Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya na-ele ya,+ na-asịkwa, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+ 22 A ga-asịkwa ya, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt.+ Ha nabatakwara chi ọzọ dị iche iche, kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.’”+
-