64 “Jehova ga-achụsasị unu ná mba niile, malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee, chi ndị unu na nna nna unu hà na-amaghị.+
19 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’ ị ga-asị ha, ‘Otú ahụ unu hapụrụ m gaa na-efe chi ndị mba ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị mba ọzọ ozi ná mba na-abụghị nke unu.’”+