-
2 Ihe E Mere 21:18-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Mgbe ihe a niile mechara, Jehova mere ka Jehoram rịawa ọrịa afọ na-enweghị ngwọta.+ 19 Ka oge na-aga, mgbe afọ abụọ zuru ezu gwụchara, ọrịa ahụ mere ka eriri afọ ya wụpụta. Ọ nwụkwara mgbe ọrịa ahụ kara njọ. Ndị ya amụnyeghịkwa ihe na-esi ísì ọma ọkụ iji kwanyere ya ùgwù otú e meere nna nna ya hà.+ 20 Ọ dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem. O nweghịkwa onye o wutere mgbe ọ nwụrụ. Ha likwara ya n’Obodo Devid,+ ma, e lighị ya ebe a na-eli ndị eze.+
-