-
2 Ndị Eze 12:18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Jehoash eze Juda wee zigara Hazel bụ́ eze Siria+ onyinye niile dị nsọ, ndị Jehoshafat, Jehoram, na Ehazaya, bụ́ ndị nna nna ya bu ya ụzọ chịa Juda, doro nsọ. O zigakwaara ya onyinye dị nsọ yanwa nyere nakwa ọlaedo niile dị ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze, Hazel alaghachizie, hapụ ịlụso Jeruselem agha.
-
-
2 Ihe E Mere 16:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Esa wee si n’akụ̀ dị n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze wepụta ọlaọcha na ọlaedo+ bugara Ben-hedad eze Siria,+ onye bi na Damaskọs. Ọ gwakwara Ben-hedad, sị: 3 “Mụ na gị gbara ndụ. Nna m na nna gị gbakwara ndụ. M na-ebutere gị ọlaọcha na ọlaedo. Bịa mebie ọgbụgba ndụ gị na Beasha eze Izrel, ka o wee hapụ m.”
-