-
Aịzaya 22:20-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “‘N’oge ahụ, m ga-akpọ onye na-ejere m ozi, bụ́ Elayakim+ nwa Hilkaya, 21 yiwe ya uwe mwụda gị, were ákwà ị na-eke n’úkwù kesie ya ike,+ nyefeekwa ya ọchịchị* gị. Ọ ga-aghọkwara ndị bi na Jeruselem na ezinụlọ Juda nna. 22 M ga-atụkwasị mkpịsị ugodi ụlọ Devid+ n’ubu ya. O nweghị onye ga-emechi ụzọ o meghere. O nweghịkwa onye ga-emeghe ụzọ o mechiri. 23 M ga-eme ka o sie ike ka ntu a kụbara n’ahụ́ ụlọ siri ike. Ọ ga-abụkwara ezinụlọ nna ya ocheeze dị ebube. 24 Ha ga-ekokwasị ya ebube niile ezinụlọ nna ya nwere, ma ụmụ ma ụmụ ụmụ* ma arịa niile dị ntakịrị ma efere ma nnukwu ite niile.
-