17 Jehova, i meela ka ọnọdụ anyị yie ọnọdụ nwaanyị dị ime,
Nke oge o ji amụ nwa ruru, ime ana-eme ya,
Ya ana-eti mkpu n’ihi otú o si egbu ya mgbu.
18 Anyị bịara dị ime, ime emewe anyị.
Ma, ọ dị ka à ga-asị na anyị mụrụ ifufe.
Anyị azọpụtaghị ala a.
Anyị amụtaghịkwa ndị ga-ebi n’ala a.