13 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ a ga-eji maka ya na-eto aha m.+ M ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.+ 14 M ga-abụ nna ya, yanwa ga-abụkwa nwa m.+ Ya mee ihe ọjọọ, m ga-agbazi ya, jirikwa ụtarị dọọ ya aka ná ntị otú ụmụ mmadụ na-eme.+