-
1 Ndị Eze 8:33, 34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 “Ọ bụrụ na ndị iro emerie ndị Izrel bụ́ ndị gị n’ihi na ha na-emehie gị,+ ha emechaa lọghachikwute gị ma bịa nọrọ n’ụlọ a too aha gị,+ kpee ekpere, rịọkwa gị arịrịọ ka i meere ha amara,+ 34 biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha, gbaghara mmehie ndị Izrel bụ́ ndị gị, ma kpọghachi ha n’ala i nyere ndị nna nna ha.+
-