-
1 Samuel 8:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ọ sịrị: “Ihe a ka eze ga na-achị unu nwere ikike ime:+ Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwoke,+ ha abụrụ ndị agha ga na-agba ụgbọ ịnyịnya ya,+ na-agbakwa ịnyịnya ya.+ Ụfọdụ ga na-agbakwa ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya. 12 Ọ ga-ahọpụtakwara onwe ya ndị isi agha ga na-edu otu puku otu puku ndị agha+ na ndị nke ga na-edu ndị agha iri ise iri ise.+ Ọ ga-ahọpụtakwa ụfọdụ ka ha na-akọrọ ya ubi,+ na-ewekwara ya ihe ubi,+ na-akpụkwara ya ngwá agha na ngwá ụgbọ ịnyịnya.+
-