-
Ezra 5:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ndị amụma bụ́ Hagaị+ na Zekaraya+ nwa nwa Ido+ wee buoro ndị Juu nọ na Juda na Jeruselem amụma n’aha Chineke Izrel, onye nọnyeere ha. 2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerubabel+ nwa Shieltiel na Jeshụa+ nwa Jehozadak malitere ịrụghachi ụlọ Chineke+ dị na Jeruselem. Ndị amụma Chineke nọnyeere ha ma na-enyere ha aka.+
-
-
Zekaraya 6:15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ndị nọ n’ebe dị anya ga-abịa soro rụọ ụlọ nsọ Jehova.” Unu ga-amatakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute unu. Ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.’”
-