-
Esta 9:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 N’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda,*+ mgbe oge ruru ka e mee ihe eze kwuru na ihe o tiri n’iwu,+ n’ụbọchị ndị iro ndị Juu nọ na-eche ka ha merie ha, egwú dagharịrị, ndị Juu emerie ndị kpọrọ ha asị.+ 2 Ndị Juu zukọrọ n’obodo ha dị iche iche, n’ógbè* niile Eze Ahazuirọs na-achị,+ iji lụso ndị ahụ niile chọrọ ime ha ihe ọjọọ ọgụ. O nweghịkwa onye pụtaliri ịlụso ha ọgụ, n’ihi na mmadụ niile na-atụ ha ụjọ.+
-