14 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+
Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+
15 Na-echetanụ ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Na-echetanụ nkwa o kwere ruo otu puku ọgbọ.+
16 Ọ bụ ya na Ebreham gbara ndụ ahụ.+
Ọ ṅụkwaara Aịzik iyi.+
17 Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ike+
Nakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara.
18 Ọ sịrị, ‘M ga-enye unu ala Kenan+
Ka ọ bụrụ ihe unu ketara.’+