-
Jenesis 33:12-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Mgbe e mechara, Ịsọ sịrị ya: “Ka anyị kwalie lawa, ka m butere gị ụzọ.” 13 Ma Jekọb sịrị ya: “Onyenwe m ma na ụmụaka a esighị ike,+ marakwa na m na-elekọta atụrụ na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha n’ike otu ụbọchị, ìgwè anụ a niile ga-anwụ. 14 Biko, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ gawa, ma m ga na-abịa nwayọọ nwayọọ otú ike kwere anụ ụlọ ndị a na ụmụaka m ruo mgbe m ga-abịakwute onyenwe m n’obodo Sia.”+
-