15 Jahazayel wee sị: “Ndị Juda niile na ndị bi na Jeruselem, nakwa Eze Jehoshafat, geenụ ntị. Nụrụnụ ihe Jehova gwara unu. Ọ sịrị: ‘Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi ìgwè mmadụ a. Agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+
17 Unu agaghị eso alụ agha a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe+ ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.+ Ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.+ Gakwurunụ ha echi. Jehova ga-anọnyekwara unu.’”+