41 Ma, Ịsọ buuru Jekọb iwe n’obi maka na ọ bụ Jekọb ka nna ya gọziri.+ Ịsọ nọ na-asị n’obi ya: “Oge a ga-eru uju nna m na-eru nso.+ E mechaa, m ga-egbu Jekọb nwanne m nwoke.”
11 N’ihi na ihe a bụ ozi unu nụrụ ná mmalite, na anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya.+12 Anyị ekwesịghị ịdị ka Ken, onye si n’ajọ onye ahụ, onye gbukwara nwanne ya.+ Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ maka na ọrụ ya jọrọ njọ,+ ma ọrụ nwanne ya dị mma.+