-
Diuterọnọmi 28:53-55Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
53 N’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala, unu ga-eri ụmụ* unu, ya bụ, anụ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ bụ́ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.
54 “Nwoke nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe kacha emetụ n’ahụ́ n’ime unu, agaghịdị emetere nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ụmụ ya ndị fọrọ afọ ebere. 55 Ọ gaghịkwa enyetụ ha anụ nwa ya nke ọ bụla ọ ga-eri, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ọzọ o nwere n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.+
-