19 Rabshake wee sị ha: “Biko, gwanụ Hezekaya, sị, ‘Eze ukwu, bụ́ eze Asiria, sịrị: “Gịnị kara gị obi?+ 20 Ị na-asị, ‘M nwere ndị agha ga-alụ agha a. M haziekwala otú m ga-esi alụ ya.’ Ma, ihe ị na-agba bụ égbè ọnụ. Ònye ka ị tụkwasịrị obi, mere obi ji kaa gị gị enupụrụ m isi?+