-
2 Ndị Eze 19:35-37Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
35 N’abalị ahụ, mmụọ ozi Jehova gara n’ebe ndị Asiria mara ụlọikwuu gbuo otu narị puku mmadụ na puku iri asatọ na puku ise (185,000).+ Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, ha hụrụ ozu ndị ahụ niile e gburu.+ 36 Mgbe ihe a mechara, Senakerib eze Asiria laghachiri Ninive,+ nọrọkwa ebe ahụ.+ 37 Ka ọ nọ na-akpọ isiala n’ụlọ chi ya bụ́ Nisrọk, ụmụ ya, bụ́ Adramelek na Shariza, weere mma agha gbuo ya+ ma gbaga Ararat.+ Isa-hadọn+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.
-