28Ehaz+ dị afọ iri abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Devid nna nna ya mere ihe dị mma n’anya Jehova, ma o meghị ka Devid.+
3 O sukwara àjà ọkụ na Ndagwurugwu Nwa Hinọm,* kpọọkwa ụmụ ya ndị nwoke ọkụ iji chụọ àjà.+ Ihe a o mere bụ arụ mba ndị+ Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel nọ na-akpa.
6 Ọ kpọkwara ụmụ ya ọkụ na Ndagwurugwu Nwa Hinọm+ iji chụọ àjà.+ O mere anwansi,*+ gbaa afa, mee mgbaasị. Ọ họpụtakwara ndị ga na-agba afa na ndị ga na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.