-
2 Ihe E Mere 36:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Jehoyakin+ dị afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị ọnwa atọ na ụbọchị iri na Jeruselem. Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 10 Ná mmalite afọ, Eze Nebukadneza dunyere ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya Babịlọn,+ butekwa arịa ndị bara ezigbo uru dị n’ụlọ Jehova.+ O chikwara Zedekaya nwanne nna Jehoyakin eze Juda na Jeruselem.+
-
-
Jeremaya 29:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, ndị nchụàjà, ndị amụma, na mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. 2 O zigara ya mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ,+ ya na nne eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem, nakwa ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.*
-