49 “Jehova ga-eme ka mba dị n’ebe dị anya si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa lụso unu agha.+ Ọ ga-alụso unu agha n’ike otú ugo si efekwasị n’ihe ọ chọrọ iburu.+ Ọ ga-abụ mba unu na-agaghị aghọta asụsụ ha,+50 mba nke na-emenye mmadụ ụjọ, nke na-agaghị akwanyere agadi ùgwù ma ọ bụ meere onye na-eto eto ebere.+
24 M ga-akpọbata ndị kacha njọ ná mba niile.+ Ha ga-ebichikwa n’ụlọ ndị obodo a.+ M ga-emekwa ka ndị dị ike kwụsị nganga ha na-akpa. A ga-emerụkwa ebe nsọ ha.+