2 M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba. M ga-agọzi gị. M ga-eme ka aha gị na-ede ude, a ga-esikwa n’aka gị gọzie ndị mmadụ.+3 M ga-agọzi ndị na-agọzi gị. M ga-abụ onye na-akpọ gị iyi ọnụ,+ a ga-esikwa n’aka gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.”+
12 Jehova ga-emepere unu eluigwe ya otú mmadụ si emepe ebe ọ kwasara ezigbo ihe ma mee ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya,+ gọziekwa ihe niile unu na-eme. Unu ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma e nweghị ihe ga-eme ka unu gbaziri ihe.+
13 Otú ahụ unu bụụrụ mba dị iche iche ihe e ji abụ ọnụ,+ unu ụlọ Juda na ụlọ Izrel, otú ahụ ka m ga-azọpụta unu, unu abụrụzie ngọzi.+ Unu atụla egwu.+ Nweenụ obi ike.’*+