48 Eze wee bulie Daniel n’ọkwá, nye ya ọtụtụ ọmarịcha onyinye, meekwa ka ọ bụrụ onye na-achị ógbè* niile dị na Babịlọn+ nakwa onyeisi* ndị niile ma ihe na Babịlọn.
13 N’ihi ya, a kpọtara Daniel n’ihu eze. Eze jụrụ Daniel, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Daniel, onye so ná ndị Juda a dọtara n’agha,+ ndị nna m,* eze, si Juda kpọta?+
29 Belshaza nyeziri iwu, e wee yiwe Daniel uwe na-acha pọpụl, yinyekwa ya ihe olu ọlaedo n’olu. A makwara ọkwa na ọ ga-abụ onye nke atọ na-achị n’alaeze ahụ.+