-
2 Ndị Eze 17:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ha nọ na-ajụ idebe iwu ya na ime ihe ya na ndị nna nna ha kwekọrịtara mgbe ha na ya gbara ndụ.+ Ha egeghịkwa ntị n’ihe ndị o chetaara ha, ndị o ji dọọ ha aka ná ntị.+ Ha nọkwa na-efe arụsị ndị na-abaghị uru,+ ghọọkwa ndị na-abaghị uru n’onwe ha.+ Ha si otú a na-eme ka mba ndị gbara ha gburugburu, ndị Jehova gwara ha ka ha ghara ime ka ha.+
16 Ha hapụrụ idebe iwu niile Jehova bụ́ Chineke ha nyere ha. Ha kpụrụ ụmụ ehi abụọ,+ rụọkwa ogwe osisi arụsị.*+ Ha nọkwa na-akpọrọ ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ na-efekwa Bel.+
-