-
Ọpụpụ 10:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Igurube ndị ahụ febatara n’Ijipt niile ma ju ebe niile n’ala Ijipt.+ Ha karịrị akarị.+ E nwetụbeghị mgbe igurube juru eju otú a, e nweghịkwa mgbe a ga-enwe ya ọtụtụ otú a ọzọ. 15 Ha kpuchiri ala ahụ niile ma mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị. Ha richapụrụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ na mkpụrụ niile dị n’osisi ndị akụ́ mmiri ígwé na-emebighị. E nweghị ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ fọrọ n’elu osisi ma ọ bụ n’ahịhịa dị n’ọhịa n’Ijipt niile.
-