38 Ha nọ na-egbu ndị aka ha dị ọcha,+
Ya bụ, ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,
Ndị ha ji chụọrọ arụsị dị iche iche ndị Kenan na-efe àjà.+
Ọbara ndị ha gburu wee merụọ ala ahụ.
39 Ihe ndị ha na-eme mere ka ha gharazie ịdị ọcha.
Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke fewe chi ọzọ.+