22 Ma nke ahụ a ghara n’ebe ogwu juru bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke oge a*+ na akụnụba nke na-aghọgbu ndị mmadụ na-akpagbu okwu ahụ, okwu ahụ aghara ịmị mkpụrụ.+
13 O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ. N’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”+