11 Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim n’ihi na unu echegharịala.+ Ma onye ka m ike na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.+ Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ+ na ọkụ mee unu baptizim.+
15 (Jọn gbara àmà banyere ya. N’eziokwu, o tiri mkpu, sị: “Ọ bụ onye a ka m kwuru banyere ya, sị, ‘Onye na-abịa n’azụ m agafeela n’ihu m n’ihi na ọ dị adị tupu mụnwa.’”)+