-
Luk 7:31-35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 “Oleezi ndị m kwesịrị iji ọgbọ a tụnyere? Oleekwa ndị ha yiri?+ 32 Ha yiri ụmụaka ndị nọ ọdụ n’ọma ahịa na-agwa ibe ha, sị: ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú. Anyị bere ezigbo ákwá, ma unu ebeghị ákwá.’ 33 Jọn Onye Na-eme Baptizim bịakwara, ọ naghị ata achịcha, ọ naghịkwa aṅụ mmanya,+ ma unu na-asị: ‘Mmụọ ọjọọ ji ya.’ 34 Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya, ma unu na-asị: ‘Ọ na-eri oké nri, na-aṅụkwa oké mmanya. Ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’+ 35 Ma, ihe na-egosi na mmadụ ma ihe bụ ihe ndị dị mma ọ na-eme.”+
-