3 O wee matịa aka bitụ ya aka, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya.+ 4 Jizọs wee sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ya,+ kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa onyinye Mosis kwuru ka a na-enye,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”