-
Mak 14:29-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị,* agaghị m ahapụ gị.”+ 30 Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị na n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ taa.”+ 31 Ma ọ nọ na-ekwusi ike, sị: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.” Ndị ọzọ malitekwara ikwu otu ihe ahụ.+
-