53 Ha duuru Jizọs gakwuru nnukwu onye nchụàjà.+ Ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ niile zukọkwara.+54 Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. O sokwa ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ na-anya ọkụ n’otu ọkụ na-enwusi ike.+
54 Ha wee jide ya, kpụrụ ya pụọ,+ kpụbata ya n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà. Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ha.+55 Mgbe ha kwanyere ọkụ n’etiti mbara èzí wee nọdụ ala, Pita sokwa ha nọrọ ọdụ ebe ahụ.+