-
Matiu 15:15-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Pita asị ya: “Mee ka ihe atụ a doo anyị anya.” 16 O wee sị: “Ọ̀ bụ na ununwa kwa aghọtaghị?+ 17 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ihe ọ bụla nke na-abanye n’ọnụ na-agafe banye n’afọ, e mechaa, a nyụpụ ya? 18 Ma, ihe ọ bụla si n’ọnụ pụta si n’obi, ọ bụkwa ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ.+ 19 Dị ka ihe atụ, echiche ọjọọ nke na-akpata igbu mmadụ,* ịkwa iko,* izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, na-esicha n’obi apụta.+ 20 Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ, ma iji aka a na-akwọghị akwọ* eri nri anaghị emerụ mmadụ.”
-