-
Matiu 15:22-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Ma, otu nwaanyị Finishia nke si n’ógbè ahụ bịakwutere ya wee tie mkpu, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid. Mmụọ ọjọọ ji nwa m nwaanyị aka ọjọọ.”+ 23 Ma ọ tụpụrụghị nwaanyị ahụ ọnụ. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara malite ịgwa ya, sị: “Sị ya lawa, n’ihi na ọ na-ebe ákwá na-esogharị anyị.” 24 O wee, sị: “E zitere m maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel, ọ bụghị maka ndị ọ bụla ọzọ.”+ 25 Ma nwaanyị ahụ bịara, kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka.” 26 Ya asị ya: “E kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” 27 O wee sị: “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị. Ma, ụmụ nkịta na-eri iberibe ihe si na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.”+ 28 Jizọs gwaziri ya, sị: “Nwaanyị, i nwere ezigbo okwukwe. Ka e meere gị ihe ị rịọrọ.” E wee gwọọ nwa ya nwaanyị n’oge ahụ.
-