-
Matiu 21:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 O wee hụ otu osisi fig n’akụkụ ụzọ wee jee na ya, ma e nweghị ihe ọ hụrụ n’elu ya ma e wezụga akwụkwọ ndụ.+ O wee sị osisi ahụ: “Amịla mkpụrụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Osisi fig ahụ wee kpọnwụọ ozugbo. 20 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, o juru ha anya. Ha wee sị: “Olee otú osisi fig a si kpọnwụọ ozugbo?”+
-