62 Nnukwu onye nchụàjà wee bilie ọtọ, sị ya: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+ 63 Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ N’ihi ya, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”+